Mak 1:25
Mark 1:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Jisọs baara ya mba sị ya, “Mechie ọnụ sikwa nʼime ya pụta!”
Mark 1:25 in English
Mark 1:25 · Berean Standard Bible
But Jesus rebuked the spirit. “Be silent!” He said. “Come out of him!”
Context
23Ma nʼotu oge ahụ, otu nwoke nọ nʼime ụlọ ekpere ahụ nke mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya, tiri mkpu nʼoke olu, 24sị, “Gịnị ka anyị na gị nwekọrọ, gị Jisọs onye Nazaret? Ị bịala ịla anyị nʼiyi? Amaara m onye ị bụ, Onye Nsọ nke Chineke.” 25Ma Jisọs baara ya mba sị ya, “Mechie ọnụ sikwa nʼime ya pụta!” 26Mmụọ ahụ na-adịghị ọcha seere ya, mee ka ahụ ya maa jijiji, o tiri mkpu nʼoke olu, ma sikwa nʼime ya pụta. 27Ha niile bụ ndị nọ nʼọnọdụ ihe iju anya ma na-ajụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị bụ nke a? Ozizi ọhụrụ ya na ikike! Ọ na-enye ọ bụladị mmụọ na-adịghị ọcha iwu. Ha na-erubekwara ya isi.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.