Matiu 9:27
Matthew 9:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe Jisọs si nʼebe ahụ na-apụ, ụmụ nwoke abụọ ndị kpuru ìsì sooro ya. Ha tikuru ya mkpu na-asị, “Nwa Devid, meere anyị ebere!”
Matthew 9:27 in English
Matthew 9:27 · Berean Standard Bible
As Jesus went on from there, two blind men followed Him, crying out, “Have mercy on us, Son of David!”
Context
25Ma mgbe achụpụsịrị igwe mmadụ ahụ, ọ banyere nʼime ụlọ, jide nwata nwanyị ahụ nʼaka, o bilie ọtọ. 26Akụkọ ọrụ ebube a gbasara nʼebe niile nʼala ahụ. 27Mgbe Jisọs si nʼebe ahụ na-apụ, ụmụ nwoke abụọ ndị kpuru ìsì sooro ya. Ha tikuru ya mkpu na-asị, “Nwa Devid, meere anyị ebere!” 28Ha sooro ya bata nʼụlọ ebe ọ nọ. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Unu kwere na m nwere ike ime ka unu hụ ụzọ?”
Ha zara sị ya, “E, Onyenwe anyị, anyị kweere.” 29O metụrụ ha aka nʼanya sị ha, “Ya dịrị unu dị ka okwukwe unu si dị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.