Native Bible

Matthew 5:46 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụrụ naanị ndị hụrụ unu nʼanya ka unu na-ahụ nʼanya, gịnị ga-abụ ụgwọ ọrụ unu? Ọ bụladị ndị ọna ụtụ na-emekwa otu a.

Matthew 5:46 in English

Matthew 5:46 · Berean Standard Bible

If you love those who love you, what reward will you get? Do not even tax collectors do the same?

Context

44Ma asị m unu, hụnụ ndị iro unu nʼanya, kpekwaaranụ ndị na-esogbu unu ekpere. 45Nke a ga-eme ka unu bụrụ ụmụ nke Nna unu bi nʼeluigwe, onye na-eme ka anwụ mụọrọ ndị ọma na ndị ọjọọ, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume. 46Ọ bụrụ naanị ndị hụrụ unu nʼanya ka unu na-ahụ nʼanya, gịnị ga-abụ ụgwọ ọrụ unu? Ọ bụladị ndị ọna ụtụ na-emekwa otu a. 47Ọ bụrụkwa na unu na-ekele naanị ndị enyi unu ekele, ọ dịghị ihe ọbụla dị iche nʼebe unu na ndị ọzọ nọ. Nʼihi na ndị na-amaghị Chineke na-emekwa otu ahụ. 48Ya mere, unu kwesiri izuoke nʼịrụ ọrụ ọma, dịka Nna unu bi nʼeluigwe si zukwaa oke. 5:21 Ọpụ 20:13 5:22 Ọfọ ogori, nʼokwu nlelị anya 5:22 Nke a pụtara nwanna nʼime Kraịst 5:22 Maọbụ, Onye na-enweghị uche 5:26 Maọbụ, ụgwọ niile 5:27 Ọpụ 20:14 5:31 Dit 24:1 5:38 Ọpụ 21:24; Lev 24:20; Dit 19:21 5:43 Lev 19:18

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.