Matiu 27:23
Matthew 27:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ jụrụ ha sị, “Ọ bụ nʼihi gịnị? Olee ihe ọjọọ o mere?” Ma ha tiri mkpu karịa ka ha si eti na mbụ, na-asị, “Kpọgide ya nʼobe! Kpọgide ya nʼobe!”
Matthew 27:23 in English
Matthew 27:23 · Berean Standard Bible
“Why?” asked Pilate. “What evil has He done?” But they shouted all the louder, “Crucify Him!”
Context
21Ọzọkwa, gọvanọ sịrị ha, “Nʼime mmadụ abụọ ndị a onye ka unu chọrọ ka m hapụrụ unu?”
Ha sịrị, “Barabas!” 22Pailet sịrị ha, “Gịnị ka m ga-eme Jisọs onye a na-akpọ Kraịst?”
Ha niile sịrị, “Kpọgide ya nʼobe!” 23Ọ jụrụ ha sị, “Ọ bụ nʼihi gịnị? Olee ihe ọjọọ o mere?”
Ma ha tiri mkpu karịa ka ha si eti na mbụ, na-asị, “Kpọgide ya nʼobe! Kpọgide ya nʼobe!” 24Mgbe Pailet hụrụ na o nweghị ihe ọ pụrụ ime, kama na ụzụ na ọgbaaghara na-amalite. O weere mmiri kwọọ aka ya nʼihu igwe mmadụ ahụ sị ha, “Aka m dị ọcha nʼebe ọbara nwoke a dị. Jirinụ aka unu hụ maka ya.” 25Igwe mmadụ ahụ zaghachiri ya nʼotu olu sị, “Ka ọbara ya dị nʼisi anyị na nʼisi ụmụ anyị!”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.