Native Bible

Matthew 24:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ihe ndị a niile bụ naanị mmalite ịta ahụhụ nke ga-abịa.

Matthew 24:8 in English

Matthew 24:8 · Berean Standard Bible

All these are the beginning of birth pains.

Context

6Mgbe unu nụrụ ụzụ agha, na akụkọ agha dị iche iche, unu atụla egwu, nʼihi na ihe ndị a aghaghị ime. Ma ha anaghị egosi na ọgwụgwụ oge eruola. 7Mba ga-ebili megide mba ibe ya, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze ọzọ; oke ụnwụ,* na ala ọma jijiji ga-adịkwa nʼọtụtụ ebe dị iche iche. 8Ma ihe ndị a niile bụ naanị mmalite ịta ahụhụ nke ga-abịa. 9“Mgbe ahụ ha ga-arara unu nyefee nʼaka ndị ga-ata unu ahụhụ. Ha ga-egbukwa unu. Mba niile ga-akpọ unu asị nʼihi m. 10Ọtụtụ ga-ada site nʼokwukwe ha nʼoge ahụ. Ha ga-emekwa ka ibe ha ma nʼọnya, kpọọkwa ibe ha asị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.