Native Bible

Matthew 24:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe unu nụrụ ụzụ agha, na akụkọ agha dị iche iche, unu atụla egwu, nʼihi na ihe ndị a aghaghị ime. Ma ha anaghị egosi na ọgwụgwụ oge eruola.

Matthew 24:6 in English

Matthew 24:6 · Berean Standard Bible

You will hear of wars and rumors of wars, but see to it that you are not alarmed. These things must happen, but the end is still to come.

Context

4Jisọs zara ha sị, “Lezienụ anya ka onye ọbụla ghara iduhie unu ụzọ. 5Nʼihi na ọtụtụ ga-abịa nʼaha m, na-ekwu sị, ‘Abụ m Kraịst ahụ.’ Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị ụzọ. 6Mgbe unu nụrụ ụzụ agha, na akụkọ agha dị iche iche, unu atụla egwu, nʼihi na ihe ndị a aghaghị ime. Ma ha anaghị egosi na ọgwụgwụ oge eruola. 7Mba ga-ebili megide mba ibe ya, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze ọzọ; oke ụnwụ,* na ala ọma jijiji ga-adịkwa nʼọtụtụ ebe dị iche iche. 8Ma ihe ndị a niile bụ naanị mmalite ịta ahụhụ nke ga-abịa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.