Matiu 24:30
Matthew 24:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼoge ahụ akara ngosi nke Nwa nke Mmadụ ga-apụta ihe na mbara eluigwe. Agbụrụ niile nke ụwa ga-anọkwa na-eru ụjụ. Ha ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼigwe ojii, nʼike nakwa oke ebube.
Matthew 24:30 in English
Matthew 24:30 · Berean Standard Bible
At that time the sign of the Son of Man will appear in heaven,* and all the tribes of the earth will mourn. They will see the Son of Man coming on the clouds of heaven, with power and great glory.*
Context
28Matakwanụ na ebe ọbụla ozu dị, nʼebe ahụ ka udele na-ezukọta. 29“Ngwangwa mgbe mkpagbu nke ụbọchị ndị ahụ niile gabigasịrị,
“ ‘anyanwụ ga-agba ọchịchịrị.
Ọnwa agaghị enyekwa ìhè,
kpakpando ga-esi na mbara eluigwe daa,
ike niile nke eluigwe ga-ama jijiji.’* 30“Nʼoge ahụ akara ngosi nke Nwa nke Mmadụ ga-apụta ihe na mbara eluigwe. Agbụrụ niile nke ụwa ga-anọkwa na-eru ụjụ. Ha ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼigwe ojii, nʼike nakwa oke ebube. 31Ọ ga-ewerekwa olu opi ike zipụ ndị mmụọ ozi ka ha gaa kpọkọtaa ndị niile a họpụtara site nʼakụkụ anọ niile nke eluigwe na ụwa. 32“Ugbu a mụtanụ ihe site nʼosisi fiig. Mgbe ọbụla alaka ya malitere iwepụta ome dị nro, na-epupụtakwa akwụkwọ ndụ maranụ na ọkọchị na-abịa nso.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.