Matiu 21:7
Matthew 21:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha kpụtara ịnyịnya ibu ahụ na nwa ịnyịnya ahụ, wụkwasịkwa uwe ha nʼelu ha ka Jisọs nọkwasị nʼelu ha.
Matthew 21:7 in English
Matthew 21:7 · Berean Standard Bible
They brought the donkey and the colt and laid their cloaks on them, and Jesus sat on them.
Context
5“Gwanụ ada Zayọn sị,
‘lee, eze gị ka ọ na-abịakwute gị.
Ọ bụ onye dị nwayọọ. Ọ na-anọkwasịkwa nʼelu ịnyịnya ibu,
ee, nʼelu nwa ịnyịnya, nwa ịnyịnya na-ebu ibu.’ ”* 6Ndị na-eso ụzọ ya gara mee ihe Jisọs sịrị ha mee. 7Ha kpụtara ịnyịnya ibu ahụ na nwa ịnyịnya ahụ, wụkwasịkwa uwe ha nʼelu ha ka Jisọs nọkwasị nʼelu ha. 8Ọtụtụ nʼime igwe mmadụ ahụ tụsara uwe ha nʼokporoụzọ. Ndị ọzọ gbuturu alaka osisi, tụsaa ha nʼụzọ nʼihu ya. 9Ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ nọ nʼihu, na ndị na-esokwa nʼazụ, nọ na-eti mkpu nʼoke olu na-asị:
“Hozanna dịrị Nwa Devid!”
“Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!”*
“Hozanna nʼebe kachasị ihe niile elu!”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.