Matiu 20:19
Matthew 20:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
nyefekwa ya nʼaka ndị mba ọzọ, ndị ga-eji ya mee ihe ọchị, pịa ya ihe, ma kpọgide ya nʼobe. Ma nʼụbọchị nke atọ, a ga-eme ka ọ site nʼọnwụ bilie.”
Matthew 20:19 in English
Matthew 20:19 · Berean Standard Bible
and will deliver Him over to the Gentiles to be mocked and flogged and crucified. And on the third day He will be raised to life.”
Context
17Mgbe Jisọs na-aga Jerusalem, ọ kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nʼakụkụ sị ha, 18“Lee, anyị na-aga Jerusalem ebe a ga-arara Nwa nke Mmadụ nyefee nʼaka ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu. Ha ga-ama ya ikpe ọnwụ, 19nyefekwa ya nʼaka ndị mba ọzọ, ndị ga-eji ya mee ihe ọchị, pịa ya ihe, ma kpọgide ya nʼobe. Ma nʼụbọchị nke atọ, a ga-eme ka ọ site nʼọnwụ bilie.” 20Mgbe ahụ, nne ụmụ Zebedi, duuru ụmụ ya ndị ikom abụọ bịakwute ya, o gburu ikpere nʼala nʼihu ya, rịọ ya ihe ọ chọrọ ka o meere ha. 21Ọ sịrị ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?”
Ọ zara ya sị, “Kwee m nkwa na ụmụ abụọ ndị a ga-anọdụ otu nʼaka nri gị, nke ọzọ nʼaka ekpe gị nʼalaeze gị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.