Matiu 19:20
Matthew 19:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nwokorobịa ahụ sịrị ya, “Edebezuchaala m iwu ndị a siterịị na mgbe m dị na nwata. Gịnị ọzọ fọdụụrụ m ime?”
Matthew 19:20 in English
Matthew 19:20 · Berean Standard Bible
“All these I have kept,” said the young man. “What do I still lack?”
Context
18Ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Olee iwu ndị m ga-edebe?”
Jisọs zara ya, “ ‘Egbula mmadụ, akwala iko, ezula ohi, ekwula okwu ụgha. 19Sọpụrụ nne gị na nna gị.* Ọzọ, hụkwa onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị.’*” 20Nwokorobịa ahụ sịrị ya, “Edebezuchaala m iwu ndị a siterịị na mgbe m dị na nwata. Gịnị ọzọ fọdụụrụ m ime?” 21Jisọs zara sị ya, “Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ onye zuruoke nʼezie, laa nʼụlọ gị ree ihe niile i nwere, nyekwa ndị ogbenye ego i retara. Ị ga-enwe akụ nʼeluigwe, mgbe ahụ, bịakwa soro m.” 22Mgbe nwokorobịa ahụ nụrụ okwu a, ọ lara na mwute, nʼihi na ọ bụ ọgaranya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.