Native Bible

Matthew 18:34 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi iwe, Nna ya ukwuu nyefere ya nʼaka ndị nche na-eche ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ ka ha taa ya ahụhụ, ruo mgbe ọ kwụchara ụgwọ niile o ji.

Matthew 18:34 in English

Matthew 18:34 · Berean Standard Bible

In anger his master turned him over to the jailers to be tortured, until he should repay all that he owed.

Context

32“Nʼihi nke a Nna ya ukwu kpọrọ ohu ahụ sị ya, ‘Ohu obi ọjọọ! Agbaghara m gị ụgwọ ahụ niile i ji, nʼihi na ị rịọrọ m arịrịọ. 33Ọ bụ na ị kwesighị inwe obi ebere nʼebe ohu ibe gị nọ, dị ka m si mere gị ebere?’ 34Nʼihi iwe, Nna ya ukwuu nyefere ya nʼaka ndị nche na-eche ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ ka ha taa ya ahụhụ, ruo mgbe ọ kwụchara ụgwọ niile o ji. 35“Otu a ka Nna m bi nʼeluigwe ga-emekwa unu, ma ọ bụrụ na unu ejighị obi unu niile gbaghara ụmụnna unu.” 18:11 Ụfọdụ akwụkwọ mgbe ochie na-edebanye okwu ndị a dịka ọ dị nʼakwụkwọ Luk 19:10. 18:16 Dit 19:15. 18:22 Ọnụọgụgụ nke a bụ narị anọ na iri itoolu. 18:24 Ihe ruru nde naịra abụọ maọbụ karịa. 18:28 Ihe ruru otu puku naịra maọbụ o jiri ihe ntakịrị karịa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.