Matiu 18:33
Matthew 18:33 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ na ị kwesighị inwe obi ebere nʼebe ohu ibe gị nọ, dị ka m si mere gị ebere?’
Matthew 18:33 in English
Matthew 18:33 · Berean Standard Bible
Shouldn’t you have had mercy on your fellow servant, just as I had on you?’
Context
31Mgbe ndị ohu ibe ya hụrụ ihe mere, o wutere ha nke ukwuu. Ha jekwuru Nna ha ukwu kọọrọ ya ihe niile ndị a. 32“Nʼihi nke a Nna ya ukwu kpọrọ ohu ahụ sị ya, ‘Ohu obi ọjọọ! Agbaghara m gị ụgwọ ahụ niile i ji, nʼihi na ị rịọrọ m arịrịọ. 33Ọ bụ na ị kwesighị inwe obi ebere nʼebe ohu ibe gị nọ, dị ka m si mere gị ebere?’ 34Nʼihi iwe, Nna ya ukwuu nyefere ya nʼaka ndị nche na-eche ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ ka ha taa ya ahụhụ, ruo mgbe ọ kwụchara ụgwọ niile o ji. 35“Otu a ka Nna m bi nʼeluigwe ga-emekwa unu, ma ọ bụrụ na unu ejighị obi unu niile gbaghara ụmụnna unu.”
18:11 Ụfọdụ akwụkwọ mgbe ochie na-edebanye okwu ndị a dịka ọ dị nʼakwụkwọ Luk 19:10.
18:16 Dit 19:15.
18:22 Ọnụọgụgụ nke a bụ narị anọ na iri itoolu.
18:24 Ihe ruru nde naịra abụọ maọbụ karịa.
18:28 Ihe ruru otu puku naịra maọbụ o jiri ihe ntakịrị karịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.