Matiu 16:18
Matthew 16:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma mụ onwe m na-agwa gị, na gị onwe gị bụ Pita.* Ọ bụkwa nʼelu nkume a ka m ga-ewu ụlọ chọọchị m. Ike niile nke ọkụ ala mmụọ apụghịkwa iguzo megide ya.
Matthew 16:18 in English
Matthew 16:18 · Berean Standard Bible
And I tell you that you are Peter, and on this rock I will build My church, and the gates of Hades will not prevail against it.
Context
16Saimọn Pita zara sị ya, “Ị bụ Kraịst* ahụ, Ọkpara Chineke dị ndụ.” 17Jisọs gwara ya sị, “Saimọn Pita nwa Jona, ị bụ onye a gọziri agọzi, nʼihi na anụ ahụ na ọbara ekpugheghị ya nye gị. Kama, ọ bụ Nna m bi nʼeluigwe mere ka ị mata ya. 18Ma mụ onwe m na-agwa gị, na gị onwe gị bụ Pita.* Ọ bụkwa nʼelu nkume a ka m ga-ewu ụlọ chọọchị m. Ike niile nke ọkụ ala mmụọ apụghịkwa iguzo megide ya. 19Aga m enye gị mkpisi igodo alaeze eluigwe. Ihe ọbụla ị ga-eke agbụ nʼelu ụwa, ka a ga-ekekwa agbụ nʼeluigwe. Ihe ọbụla ị ga-atọpụ nʼagbụ nʼụwa, a ga-atọpụkwa ya nʼeluigwe.” 20Mgbe ahụ, o nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha ghara ime ka onye ọbụla mata na ya bụ Kraịst ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.