Matiu 15:4
Matthew 15:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na Chineke sịrị, ‘Sọpụrụ nne gị na nna gị,’* na, ‘onye ọbụla kwujọrọ nna maọbụ nne ya ka e gbuo ya.*’*
Matthew 15:4 in English
Matthew 15:4 · Berean Standard Bible
For God said, ‘Honor your father and mother’* and ‘Anyone who curses his father or mother must be put to death.’*
Context
2“Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị erube isi nʼomenaala ndị okenye? Ha anaghị akwọ aka ha tupu ha erie nri.” 3Ọ zara ha sị, “Gịnị mere unu ji na-ada iwu Chineke nʼihi omenaala unu? 4Nʼihi na Chineke sịrị, ‘Sọpụrụ nne gị na nna gị,’* na, ‘onye ọbụla kwujọrọ nna maọbụ nne ya ka e gbuo ya.*’* 5Ma unu na-asị, ọ bụrụ na onye ọbụla ga-asị nna maọbụ nne ya, ihe ọbụla bụ nke ị gara erite nʼaka m bụ ‘onyinye dịrị Chineke.’ 6Nʼihi ya, ha agaghị eji ya asọpụrụ nna ha maọbụ nne ha. Nʼụzọ dị otu a, unu na-eme ka okwu Chineke bụrụ ihe efu nʼihi omenaala unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.