Matiu 13:12
Matthew 13:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ahụ nwere ihe ka a ga-enyekwa ọzọ, ka o nwee karịa. Ma onye na-enweghị ihe ọbụla ka a ga-anapụ ọ bụladị ihe o nwere.
Matthew 13:12 in English
Matthew 13:12 · Berean Standard Bible
Whoever has will be given more, and he will have an abundance. Whoever does not have, even what he has will be taken away from him.
Context
10Emesịa, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya jụọ ya sị, “Gịnị mere i ji na-agwa ndị a okwu nʼilu?” 11Ọ zaghachiri, “Nʼihi na ọ bụ unu ka e nyere ịmata ihe omimi niile nke alaeze eluigwe. Emeghị ka ndị ọzọ ghọta ya. 12Onye ahụ nwere ihe ka a ga-enyekwa ọzọ, ka o nwee karịa. Ma onye na-enweghị ihe ọbụla ka a ga-anapụ ọ bụladị ihe o nwere. 13Nke a bụ ihe mere m ji agwa ha okwu nʼilu:
“Nʼihi na ha na-ele anya, ma ha adịghị ahụ ụzọ,
ha na-ege ntị, ma ha adịghị anụ ihe maọbụ aghọta ya. 14Nke a bụkwa imezu amụma ahụ Aịzaya buru sị,
“ ‘Unu ga na-anụ, nụkwa, ma unu agaghị aghọta ihe ọbụla.
Unu ga na-ele anya, hụkwa, ma unu agaghị ahụ ihe ọbụla.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.