Matiu 10:39
Matthew 10:39 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ọbụla chọtara ndụ ya ga-etufu ya, ma onye ọbụla tufuru ndụ ya maka m, ga-achọtakwa ya.
Matthew 10:39 in English
Matthew 10:39 · Berean Standard Bible
Whoever finds his life will lose it, and whoever loses his life for My sake will find it.
Context
37“Ọ bụrụ na ị hụrụ nne gị maọbụ nna gị nʼanya karịa m, i kwesighị ịbụ onye nke m. Ọ bụrụ na ị hụrụ nwa gị nwoke, maọbụ nwa gị nwanyị nʼanya karịa m, i kwesighị ịbụ onye nke m. 38Onye ọbụla na-eburughị obe ya soro m, ekwesighị ị bụ onye nke m. 39Onye ọbụla chọtara ndụ ya ga-etufu ya, ma onye ọbụla tufuru ndụ ya maka m, ga-achọtakwa ya. 40“Ndị niile nabatara unu na-anabata m. Mgbe ha nabatara m, ọ bụkwa Onye ahụ zitere m ka ha na-anabata. 41Ọ bụrụ na unu anabata onye amụma nʼihi na ọ bụ onye amụma, unu na onye amụma ahụ ga-enwekọ otu ụgwọ ọrụ. Ọ bụrụkwa na unu anabata onye ezi omume nʼihi ezi omume ya, unu ga-esorokwa ya nata ụgwọ ọrụ nke onye ezi omume.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.