Matiu 10:12
Matthew 10:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe unu na-abanye nʼụlọ ahụ, keleenụ ndị bi na ya sị, udo dịrị unu.
Matthew 10:12 in English
Matthew 10:12 · Berean Standard Bible
As you enter the home, greet its occupants.*
Context
10Unu ejikwala akpa maka njem unu, maọbụ uwe abụọ, maọbụ akpụkpọụkwụ, maọbụ mkpanaka. Nʼihi na onye ọrụ kwesiri ihe e ji azụ ya. 11Ma obodo ọbụla maọbụ ogbe ọbụla unu bara nʼime ya, chọọnụ ụfọdụ ndị kwesiri nsọpụrụ bi nʼobodo ahụ. Nọgidekwanụ nʼụlọ ha ruo mgbe unu ga-ahapụ obodo ahụ. 12Mgbe unu na-abanye nʼụlọ ahụ, keleenụ ndị bi na ya sị, udo dịrị unu. 13Ọ bụrụ na ndị nọ nʼụlọ ahụ anabata unu, meenụ ka udo unu bịakwasị nʼụlọ ahụ. Ọ bụrụkwanụ na ha anabataghị unu, ka udo unu lọghachikwute unu. 14Ọ bụrụ na onye ọbụla anabataghị unu, maọbụ jụ ịnụrụ okwu unu, mgbe unu na-ahapụ ụlọ ahụ maọbụ obodo ahụ kụchapụnụ aja dị nʼụkwụ unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.