Malakaị 4:2
Malachi 4:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma unu bụ ndị na-atụ egwu aha m ka anyanwụ nke ezi omume ga-achawapụta wetakwara unu ọgwụgwọ nke si nʼime nku ya. Unu ga-apụkwa, na-awụgharị dịka ụmụ ehi eji nri zujuo afọ.
Malachi 4:2 in English
Malachi 4:2 · Berean Standard Bible
“But for you who fear My name, the sun of righteousness will rise with healing in its wings,* and you will go out and leap like calves from the stall.
Context
1“Nʼezie, ụbọchị ahụ na-abịa, ọ ga-erekwa ọkụ dịka ebe a funyere ọkụ buru ibu. Mgbe ndị nganga, ndị na-eme ihe ọjọọ, ga-abụ igbugbo ọka, ụbọchị ahụ na-abịa ga-erechapụ ha,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. “Ọ dịkwaghị mgbọrọgwụ maọbụ alaka ọbụla ga-afọdụrụ ha. 2Ma unu bụ ndị na-atụ egwu aha m ka anyanwụ nke ezi omume ga-achawapụta wetakwara unu ọgwụgwọ nke si nʼime nku ya. Unu ga-apụkwa, na-awụgharị dịka ụmụ ehi eji nri zujuo afọ. 3Mgbe ahụ, unu ga-azọpịakwa ndị ajọ omume. Ha ga-aghọkwa ntụ nʼokpuru ọbụ ụkwụ unu, nʼụbọchị ahụ m ga-eme ihe ndị a,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. 4“Chetanụ iwu Mosis, bụ odibo m, ya bụ iwu na ụkpụrụ ndị ahụ dị iche iche m nyere ya na Horeb, maka Izrel niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.