Native Bible

Malachi 2:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ma ugbu a, unu ndị nchụaja, ịdọ aka na ntị a dịrị unu.

Malachi 2:1 in English

Malachi 2:1 · Berean Standard Bible

“And now this decree is for you, O priests:

Context

1“Ma ugbu a, unu ndị nchụaja, ịdọ aka na ntị a dịrị unu. 2Ọ bụrụ na unu ajụ ige ntị, ọ bụrụkwa na unu ekpebighị nʼobi unu inye aha m otuto,” ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu, “Aga m ezite ọbụbụ ọnụ nʼahụ unu, aga m abụkwa ngọzị unu niile ọnụ. E, abụọlarị unu ọnụ, nʼihi na unu ekpebighị nʼobi unu ịsọpụrụ m. 3“Nʼihi unu, aga m abara ụmụ ụmụ unu mba.* Agaghị m anabata onyinye unu, aga m efesakwa nsị anụ nʼihu unu, bụ nsị nke ihe onyinye unu, aga m ewezugakwa unu site nʼihu m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.