Malakaị 1:10
Malachi 1:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ọ gaara adị m nnọọ mma ma a sị na otu onye nʼime unu ga-emechi ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu ahụ, ka unu gharakwa ịkwanye ọkụ na-enweghị isi nʼelu ebe ịchụ aja m. Ihe banyere unu adịghị atọ m ụtọ. Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. Agaghị m anabatakwa onyinye ọbụla si unu nʼaka.
Malachi 1:10 in English
Malachi 1:10 · Berean Standard Bible
“Oh, that one of you would shut the temple doors, so that you would no longer kindle useless fires on My altar! I take no pleasure in you,” says the LORD of Hosts, “and I will accept no offering from your hands.
Context
8Mgbe unu ji anụ ndị kpuru ìsì achụrụ m aja, ọ bụghị ihe na-ezighị ezi ka unu na-eme? Mgbe unu na-ejikwa ndị dara ngwụrọ, na anụ na-arịa ọrịa, ọ bụghị ihe ọjọọ ka unu na-eme? Werenụ anụ ndị a bugara onye na-achị obodo unu dịka onyinye. Ọ ga-atọ ya ụtọ ịnabata onyinye dị otu a? Ọ ga-anabata unu?” Ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. 9“Ma ugbu a, rịọọnụ Chineke ka o gosi anyị amara ya. Ọ bụrụ na unu ji onyinye ndị dị otu a nʼaka unu, ọ ga-egosi unu afọ ọma ya?” Ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. 10“Ọ gaara adị m nnọọ mma ma a sị na otu onye nʼime unu ga-emechi ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu ahụ, ka unu gharakwa ịkwanye ọkụ na-enweghị isi nʼelu ebe ịchụ aja m. Ihe banyere unu adịghị atọ m ụtọ. Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. Agaghị m anabatakwa onyinye ọbụla si unu nʼaka. 11Nʼihi na site nʼọwụwa anyanwụ ruo ọdịda ya, aha m ga-adị ukwuu nʼetiti mba niile. A ga-ewebatara m ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na onyinye dị ọcha nʼaha m, nʼebe niile, nʼihi na aha m ga-adị ukwuu nʼetiti mba niile.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. 12“Ma unu na-eme ka ọ ghara ịdị nsọ mgbe unu na-asị na, Tebul Onyenwe anyị bụ ihe e merụrụ emerụ, ebe ihe oriri ya bụkwa ihe nlelị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.