Luk 6:26
Luke 6:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ahụhụ na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ niile na-ekwu okwu ọma gbasara unu, nʼihi na otu a ka ndị bụ nna ha mesoro ndị amụma ụgha.”
Luke 6:26 in English
Luke 6:26 · Berean Standard Bible
Woe to you when all men speak well of you, for their fathers treated the false prophets in the same way.
Context
24“Ma ahụhụ na-adịrị unu ndị ọgaranya,
nʼihi na unu eketala nkasiobi unu. 25Ahụhụ na-adịrị ndị afọ juru ugbu a,
nʼihi na agụ ga-agụkwa unu.
Ahụhụ na-adịrị ndị na-achị ọchị ugbu a,
nʼihi na unu ga-eru ụjụ, bee akwa. 26Ahụhụ na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ niile na-ekwu okwu ọma gbasara unu,
nʼihi na otu a ka ndị bụ nna ha mesoro ndị amụma ụgha.” 27“Ma a na m agwa unu ndị na-ege m ntị: hụnụ ndị iro unu nʼanya, mekwaaranụ ndị kpọrọ unu asị ihe ọma. 28Gọzienụ ndị na-abụ unu ọnụ, ma kpekwaaranụ ndị na-akparị unu ekpere.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.