Native Bible

Luke 5:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma site nʼoge ruo nʼoge, Jisọs na-ewezuga onwe ya gaa nʼebe ọ ga-anọ naanị ya ikpe ekpere.

Luke 5:16 in English

Luke 5:16 · Berean Standard Bible

Yet He frequently withdrew to the wilderness to pray.

Context

14O nyere ya iwu, “A gwakwala onye ọbụla, kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị, chụọkwa aja dị ka Mosis nyere nʼiwu maka ime ka ị dị ọcha, ka ọ bụrụ ihe ama nye ha.” 15Ma akụkọ banyere ya gbasara karịa, nke mere na igwe mmadụ bịara ịnụrụ ihe ọ na-ekwu, na ka a gwọọkwa ha nrịa nrịa. 16Ma site nʼoge ruo nʼoge, Jisọs na-ewezuga onwe ya gaa nʼebe ọ ga-anọ naanị ya ikpe ekpere. 17Otu ụbọchị, mgbe ọ nọ na-ezi ndị mmadụ ihe, ndị Farisii na ndị ozizi iwu (sitere nʼobodo nta niile dị na Galili na Judịa na Jerusalem bịa nọdụkwa ebe) ahụ. Ike Chineke dịnyekwaara ya ịgwọ ndị ọrịa. 18Nʼoge ahụ ndị ikom ụfọdụ bu otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ nʼihe ndina ya, bịara gbalịa isite nʼọnụ ụzọ ụlọ ahụ bubata ya tọgbọ ya nʼụkwụ ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.