Native Bible

Luke 4:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ozizi ya juru ha anya, nʼihi na okwu ya nwere ikike.

Luke 4:32 in English

Luke 4:32 · Berean Standard Bible

They were astonished at His teaching, because His message had authority.

Context

30Ma o sitere nʼetiti igwe mmadụ ahụ pụọ, gawara onwe ya. 31O sitere nʼebe ahụ gaa Kapanọm, obodo dịkwa na Galili. Nʼụbọchị izuike, o bidoro izi ha ihe. 32Ozizi ya juru ha anya, nʼihi na okwu ya nwere ikike. 33Otu nwoke nọ nʼime ụlọ ekpere ahụ, onye mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya. O tiri mkpu nʼoke olu, 34“Hapụ anyị! Gịnị ka ị na-achọ nʼebe anyị nọ, gị, Jisọs onye Nazaret? Ị bịara ka ị laa anyị nʼiyi? Ama m onye ị bụ, Onye Nsọ nke Chineke!”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.