Luk 4:16
Luke 4:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe o rutere Nazaret ebe ọ nọrọ too, nʼụbọchị izuike, ọ gara nʼụlọ ekpere dị ka ọ dị mbụ eme. O guzoro ọtọ ịgụ akwụkwọ nsọ.
Luke 4:16 in English
Luke 4:16 · Berean Standard Bible
Then Jesus came to Nazareth, where He had been brought up. As was His custom, He entered the synagogue on the Sabbath. And when He stood up to read,
Context
14Jisọs lọghachiri na Galili nʼike nke Mmụọ Nsọ. Akụkọ banyere ya gbasara ruo akụkụ obodo niile. 15O ziri ihe nʼọtụtụ ụlọ ekpere ha, mmadụ niile na-etokwa ya. 16Mgbe o rutere Nazaret ebe ọ nọrọ too, nʼụbọchị izuike, ọ gara nʼụlọ ekpere dị ka ọ dị mbụ eme. O guzoro ọtọ ịgụ akwụkwọ nsọ. 17E nyere ya akwụkwọ nke onye amụma Aịzaya dere. O meghere ya chọta ebe e dere sị, 18“Mmụọ nke Onyenwe anyị dị nʼahụ m,
nʼihi na o teela m mmanụ
ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye.
O zitela m ikwupụta inwere onwe nye ndị mkpọrọ,
ya na ịhụ ụzọ nye ndị kpuru ìsì,
ime ka ndị a na-emegbu emegbu nwere onwe ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.