Luke 3:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dịka e dere ya nʼakwụkwọ Aịzaya onye amụma sị, “Otu onye na-eti mkpu nʼọzara na-asị, ‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị, meenụ ka okporoụzọ ya guzozie.
Luke 3:4 in English
Luke 3:4 · Berean Standard Bible
as it is written in the book of the words of Isaiah the prophet: “A voice of one calling in the wilderness, ‘Prepare the way for the Lord, make straight paths for Him.
Context
2mgbe ahụ Anas na Kaịfas bụ ndịisi nchụaja, okwu Chineke bịakwutere Jọn nwa Zekaraya nʼime ọzara. 3Ọ gara nʼime obodo niile gbara Jọdan gburugburu na-ekwusa banyere baptizim nke nchegharị maka mgbaghara mmehie. 4Dịka e dere ya nʼakwụkwọ Aịzaya onye amụma sị,
“Otu onye na-eti mkpu nʼọzara na-asị,
‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị,
meenụ ka okporoụzọ ya guzozie. 5A ga-ekpoju ndagwurugwu ọbụla,
ugwu ọbụla na ugwu nta ọbụla ka a ga-emekwa ka ọ dị ala.
Ụzọ gbagọrọ agbagọ ka a ga-eme ka o guzozie nke ọma,
meekwa ka ụzọ ọjọọ niile dị larịị. 6Mmadụ niile ga-ahụkwa nzọpụta Chineke.’ ”*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.