Native Bible

Luke 3:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Jọn zara sị ha, “Eji m mmiri na-eme unu baptizim, ma otu onye dị ike karịa m ga-abịa, onye m na-erughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nsọ na ọkụ mee unu baptizim.

Luke 3:16 in English

Luke 3:16 · Berean Standard Bible

John answered all of them: “I baptize you with water,* but One more powerful than I will come, the straps of whose sandals I am not worthy to untie.* He will baptize you with the Holy Spirit and with fire.*

Context

14Ndị agha bịakwara jụọ ya sị, “Gịnịkwa ka anyị kwesiri ime?” Ọ sịrị ha, “Unu ejikwala ike apụnara ndị mmadụ ego ha; unu ebokwala ndị mmadụ ebubo ụgha, ka afọ ju unu nʼụgwọ a na-akwụ unu.” 15Ndị mmadụ ji olileanya na-eche na-atulekwa nʼobi ha ma Jọn ọ bụ Kraịst ahụ. 16Ma Jọn zara sị ha, “Eji m mmiri na-eme unu baptizim, ma otu onye dị ike karịa m ga-abịa, onye m na-erughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nsọ na ọkụ mee unu baptizim. 17Ihe ịfụcha ọka ya dị nʼaka ya, iji zachaa ebe ịzọcha ọka ya nke ọma, ka e kponye ezi mkpụrụ ọka wiiti nʼime ọba, ma kpoba igbugbo ọka nʼime ọkụ nke a na-apụghị imenyụ emenyụ.” 18O ji ọtụtụ okwu ọzọ dị iche iche dụọ ha ọdụ ma kwusaakwara ha oziọma.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.