Luk 23:41
Luke 23:41 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anyị na-ata ahụhụ kwesiri anyị, nʼihi na a na-ata anyị ahụhụ nʼihi ihe anyị mere, ma nwoke a emeghị ihe ọjọọ ọbụla.”
Luke 23:41 in English
Luke 23:41 · Berean Standard Bible
We are punished justly, for we are receiving what our actions deserve. But this man has done nothing wrong.”
Context
39Otu onye nʼime ndị ohi ahụ a kpọgidekwara nʼobe nʼebe ahụ kparịkwara ya sị, “Ọ bụghị gị bụ Kraịst? Zọpụtanụ onwe gị ma zọpụtakwa anyị.” 40Ma onye nke ọzọ a makwara ikpe ọnwụ baara ya mba sị, “Ị naghị atụ Chineke egwu, ị hụghị na a mara gị ikpe dị ka e si maa ya. 41Anyị na-ata ahụhụ kwesiri anyị, nʼihi na a na-ata anyị ahụhụ nʼihi ihe anyị mere, ma nwoke a emeghị ihe ọjọọ ọbụla.” 42Mgbe ahụ ọ sịrị, “Jisọs, chetakwa m mgbe ị bara nʼalaeze gị.” 43Ọ sịrị ya, “Nʼezie a agwa m gị, taa, ị ga-anọnyere m na paradaịs.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.