Native Bible

Luke 23:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha malitere ibo ya ebubo na-asị, “Anyị chọpụtara na nwoke a na-eduhie ndị obodo anyị niile, na-egbochikwa ha ịtụ ụtụ isi nye Siza, ma na-ekwukwa na ya bụ Kraịst, Eze.”

Luke 23:2 in English

Luke 23:2 · Berean Standard Bible

And they began to accuse Him, saying, “We found this man subverting our nation, forbidding payment of taxes to Caesar, and proclaiming Himself to be Christ, a King.”

Context

1Mgbe ahụ, ọha mmadụ ahụ niile biliri duru ya gakwuru Pailet. 2Ha malitere ibo ya ebubo na-asị, “Anyị chọpụtara na nwoke a na-eduhie ndị obodo anyị niile, na-egbochikwa ha ịtụ ụtụ isi nye Siza, ma na-ekwukwa na ya bụ Kraịst, Eze.” 3Ya mere Pailet jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Ọ zara ya sị, “Gị onwe gị kwuru otu a.” 4Mgbe ahụ Pailet gwara ndịisi nchụaja na igwe mmadụ ahụ, “O nweghị ihe ọjọọ ọbụla m chọpụtara nwoke a mere.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.