Luk 23:15
Luke 23:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụladị Herọd achọpụtaghị ihe ọjọọ ọbụla nʼaka ya, nke a mere o jiri kpụghachitere anyị ya. Leenụ, o nweghị ihe ọbụla o mere e kwesiri iji maa ya ikpe ọnwụ.
Luke 23:15 in English
Luke 23:15 · Berean Standard Bible
Neither has Herod, for he sent Him back to us. As you can see, He has done nothing deserving of death.
Context
13Pailet kpọkọtara ndịisi nchụaja, na ndị ndu, na ndị mmadụ ndị ọzọ 14sị ha, “Unu kpọtaara m nwoke a dị ka otu onye nʼime ndị na-akpali ndị mmadụ inupu isi. Ajụọla m ya ajụjụ nʼihu unu ma achọpụtaghị m ihe ọbụla nke unu kwesiri iji boo ya ebubo. 15Ọ bụladị Herọd achọpụtaghị ihe ọjọọ ọbụla nʼaka ya, nke a mere o jiri kpụghachitere anyị ya. Leenụ, o nweghị ihe ọbụla o mere e kwesiri iji maa ya ikpe ọnwụ. 16Ya mere aga m apịa ya ihe hapụ ya ka ọ laa.” 17Ma ọ dị mkpa na a ga-ahapụ otu onye mkpọrọ nʼoge mmemme.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.