Native Bible

Luke 22:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụ unu onwe unu bụ ndị nọnyere m nʼoge ọnwụnwa m niile.

Luke 22:28 in English

Luke 22:28 · Berean Standard Bible

You are the ones who have stood by Me in My trials.

Context

26Ma unu onwe unu agaghị adị otu a. Kama onye kachasị ibe ya ịdị elu dịrị ka onye dịkarịsịrị nta. Ka onyeisi dịrị ka onye na-eje ozi. 27Onye dị elu karịa ibe ya? Ọ bụ onye nọdụrụ ala rie nri na tebul ka ọ bụ onye siri nri dozie ya na tebul? Ọ bụghị onye nọdụrụ ala rie nri na tebul? Ma adị m ka onye na-eje ozi nʼetiti unu. 28Ọ bụ unu onwe unu bụ ndị nọnyere m nʼoge ọnwụnwa m niile. 29Ana m enye unu alaeze dị ka Nna m nyere m ya. 30Ka unu nwe ike isoro m rie ma ṅụọkwa nʼalaeze m. Sorokwa m nọdụ nʼocheeze na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.