Native Bible

Luke 19:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị ahụ o zipụrụ gara hụ ya dị ka ọ gwara ha.

Luke 19:32 in English

Luke 19:32 · Berean Standard Bible

So those who were sent went out and found it just as Jesus had told them.

Context

30sị, “Gaanụ nʼime obodo nta ahụ dị nʼihu unu. Mgbe unu na-abanye nʼime ya, unu ga-ahụ nwa ịnyịnya e kenyere nʼebe ahụ nke onye ọbụla na-anọkwasịbeghi nʼelu ya, tọpụnụ ya, kpụtara m ya. 31Ọ bụrụ na onye ọbụla ajụọ unu, ‘Gịnị mere unu ji atọpụ ya?’ Gwanụ onye ahụ sị, ‘Ọ dị Onyenwe anyị mkpa.’ ” 32Ndị ahụ o zipụrụ gara hụ ya dị ka ọ gwara ha. 33Mgbe ha bidoro ịtọpụ ya, ndị nwe ya jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji atọpụ nwa ịnyịnya ahụ?” 34Ha sịrị, “Ọ dị Onyenwe anyị mkpa.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.