Native Bible

Luke 15:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ kpọrọ otu nʼime ndị ohu jụọ ya ihe na-eme.

Luke 15:26 in English

Luke 15:26 · Berean Standard Bible

So he called one of the servants and asked what was going on.

Context

24Nʼihi na nwa m a, nwụrụ anwụ ma ọ dịla ndụ ọzọ. O fukwara efu ma a chọtala ya.’ Ha bidoro na-eri, na-aṅụ na-aṅụrịkwa ọṅụ. 25“Ọ dịghị anya, nwa ya nke okenye, onye jere ịrụ ọrụ nʼubi, mgbe ọ na-abịaru ụlọ nso, ọ nụrụ ụda egwu na ịgba egwu. 26Ọ kpọrọ otu nʼime ndị ohu jụọ ya ihe na-eme. 27Ọ sịrị ya, ‘Nwanne gị nwoke alọtala. Nna gị egbuola nwa ehi gbara abụba nʼihi na ọ lọtara nʼudo na ahụ ike.’ 28“Iwe were ya, ọ jụrụ ịbata nʼime ụlọ. Nna ya pụtara nʼezi rịọ ya arịrịọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.