Luk 15:24
Luke 15:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na nwa m a, nwụrụ anwụ ma ọ dịla ndụ ọzọ. O fukwara efu ma a chọtala ya.’ Ha bidoro na-eri, na-aṅụ na-aṅụrịkwa ọṅụ.
Luke 15:24 in English
Luke 15:24 · Berean Standard Bible
For this son of mine was dead and is alive again! He was lost and is found!’ So they began to celebrate.
Context
22“Ma nna ya gwara ndị ohu ya sị, ‘Meenụ ngwangwa weta uwe kachasị mma yikwasị ya. Gbanye ya ọlaaka nʼaka, yinyekwanụ ya akpụkpọụkwụ nʼụkwụ. 23Gaanụ kpụpụta nwa ehi gbara abụba, gbuo ya, ka anyị rie ma ṅụrịakwa. 24Nʼihi na nwa m a, nwụrụ anwụ ma ọ dịla ndụ ọzọ. O fukwara efu ma a chọtala ya.’ Ha bidoro na-eri, na-aṅụ na-aṅụrịkwa ọṅụ. 25“Ọ dịghị anya, nwa ya nke okenye, onye jere ịrụ ọrụ nʼubi, mgbe ọ na-abịaru ụlọ nso, ọ nụrụ ụda egwu na ịgba egwu. 26Ọ kpọrọ otu nʼime ndị ohu jụọ ya ihe na-eme.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.