Luk 12:49
Luke 12:49 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“A bịara m iwebata ọkụ nʼelu ụwa, ọ gaara adịrị m nọ mma ma ọ bụrụ na ọ malitelarị inwu!
Luke 12:49 in English
Luke 12:49 · Berean Standard Bible
I have come to ignite a fire on the earth, and how I wish it were already kindled!
Context
47“Ohu ahụ maara ihe nna ya ukwu chọrọ ma hapụ ịnọ na njikere, maọbụ ime ya, ka a ga-apịasi ụtarị ike. 48Ma onye na-amaghị ama ma mee ihe kwesiri ka a pịa ya ụtarị, a ga-apịa ya ụtarị ole na ole. Nʼihi na ọ bụ onye e nyere ihe hiri nne ka a ga-ele anya ịnata ihe hiri nne nʼaka. Onye e nyekwara ihe ukwu nʼaka idebe, nʼaka ya ka a ga-achọ ihe nke kachasịnụ. 49“A bịara m iwebata ọkụ nʼelu ụwa, ọ gaara adịrị m nọ mma ma ọ bụrụ na ọ malitelarị inwu! 50Enwere m baptizim nke m na-aghaghị ime, ma aga m anọgide nʼoke ihe mgbu tutu e mezuo ya 51Unu chere na m bịara iweta udo nʼụwa? Asị m unu mbaa, kama nkewa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.