Luk 11:4
Luke 11:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gbaghara anyị mmehie anyị, nʼihi na anyị na-agbaghara onye ọbụla mehiere megide anyị. Ekwela ka anyị daba nʼime ọnwụnwa.’ ”
Luke 11:4 in English
Luke 11:4 · Berean Standard Bible
And forgive us our sins, for we also forgive everyone who sins against us. And lead us not into temptation.*’”
Context
2Ọ sịrị ha, “Mgbe unu na-ekpe ekpere, sịnụ:
“ ‘Nna,
ka e doo aha gị nsọ
ka alaeze gị bịa. 3Nye anyị taa nri nke ụbọchị anyị. 4Gbaghara anyị mmehie anyị,
nʼihi na anyị na-agbaghara onye ọbụla mehiere megide anyị.
Ekwela ka anyị daba nʼime ọnwụnwa.’ ” 5Ọ sịrị ha, “Onye nʼime unu nwere enyi, ga-agakwuru ya nʼetiti abalị sị ya, ‘Enyi m, biko gbazinye m ogbe achịcha atọ, 6nʼihi na otu enyi m bịara nʼụlọ m, ma enweghị m nri ọbụla nʼụlọ m nke m ga-enye ya.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.