Levitikọs 9:8
Leviticus 9:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Erọn bịara nso nʼebe ịchụ aja, gbuo nwa ehi ahụ ka ọ bụrụ aja mmehie nke ya.
Leviticus 9:8 in English
Leviticus 9:8 · Berean Standard Bible
So Aaron approached the altar and slaughtered the calf as a sin offering for himself.
Context
6Mgbe ahụ, Mosis sịrị ha, “Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị nyere unu nʼiwu idebe, ka ebube ya si otu a pụta ìhè nʼihu unu.” 7Mosis sịrị Erọn, “Bịa nso nʼebe ịchụ aja. Chụọ aja mmehie, na aja nsure ọkụ nke a ga-eji kpuchie mmehie gị na mmehie ndị ahụ niile. Chụọ aja onyinye dịrị ndị ahụ, maka ikpuchiri ha mmehie ha, dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu.” 8Erọn bịara nso nʼebe ịchụ aja, gbuo nwa ehi ahụ ka ọ bụrụ aja mmehie nke ya. 9Ụmụ Erọn buteere ya ọbara ehi ahụ. O tinyere mkpịsịaka ya nʼime ọbara ahụ tee ya na mpi dị nʼebe ịchụ aja. Ọ wụrụ ọbara fọdụrụ nʼụkwụ ala ala ebe ịchụ aja ahụ. 10Ọ kpọrọ abụba ya, na akụrụ ya abụọ, na ihe kpuchiri umeju si nʼaja mmehie ahụ ọkụ nʼebe ịchụ aja dịka Onyenwe anyị nyere Mosis iwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.