Levitikọs 9:7
Leviticus 9:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mosis sịrị Erọn, “Bịa nso nʼebe ịchụ aja. Chụọ aja mmehie, na aja nsure ọkụ nke a ga-eji kpuchie mmehie gị na mmehie ndị ahụ niile. Chụọ aja onyinye dịrị ndị ahụ, maka ikpuchiri ha mmehie ha, dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu.”
Leviticus 9:7 in English
Leviticus 9:7 · Berean Standard Bible
Then Moses said to Aaron, “Approach the altar and sacrifice your sin offering and your burnt offering to make atonement for yourself and for the people. And sacrifice the people’s offering to make atonement for them, as the LORD has commanded.”
Context
5Ha wetara ihe ndị a niile bịa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute dịka Mosis nyere nʼiwu. Ọgbakọ ụmụ Izrel niile bịara nso guzo nʼihu Onyenwe anyị. 6Mgbe ahụ, Mosis sịrị ha, “Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị nyere unu nʼiwu idebe, ka ebube ya si otu a pụta ìhè nʼihu unu.” 7Mosis sịrị Erọn, “Bịa nso nʼebe ịchụ aja. Chụọ aja mmehie, na aja nsure ọkụ nke a ga-eji kpuchie mmehie gị na mmehie ndị ahụ niile. Chụọ aja onyinye dịrị ndị ahụ, maka ikpuchiri ha mmehie ha, dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu.” 8Erọn bịara nso nʼebe ịchụ aja, gbuo nwa ehi ahụ ka ọ bụrụ aja mmehie nke ya. 9Ụmụ Erọn buteere ya ọbara ehi ahụ. O tinyere mkpịsịaka ya nʼime ọbara ahụ tee ya na mpi dị nʼebe ịchụ aja. Ọ wụrụ ọbara fọdụrụ nʼụkwụ ala ala ebe ịchụ aja ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.