Native Bible

Leviticus 9:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ gwakwara ụmụ Izrel sị ha, ‘Họrọnụ mkpi a ga-eji chụọ aja mmehie, na nwa ehi, na nwa atụrụ na-enweghị ntụpọ, ndị gbara naanị otu afọ, a ga-eji chụọ aja nsure ọkụ,

Leviticus 9:3 in English

Leviticus 9:3 · Berean Standard Bible

Then speak to the Israelites and say, ‘Take a male goat for a sin offering, a calf and a lamb—both a year old and without blemish—for a burnt offering,

Context

1Nʼụbọchị nke asatọ, Mosis kpọrọ Erọn na ụmụ ya ndị ikom, na ndị okenye Izrel. 2Ọ gwara Erọn sị, “Site nʼime igwe ehi were nwa oke ehi ị ga-eji chụọ aja mmehie. Werekwa ebule na-enweghị ntụpọ ị ga-eji chụọ aja nsure ọkụ, nke m ga-eche nʼihu Onyenwe anyị. 3Ọ gwakwara ụmụ Izrel sị ha, ‘Họrọnụ mkpi a ga-eji chụọ aja mmehie, na nwa ehi, na nwa atụrụ na-enweghị ntụpọ, ndị gbara naanị otu afọ, a ga-eji chụọ aja nsure ọkụ, 4na ehi, na ebule a ga-eji chụọ aja udo nʼihu Onyenwe anyị, tinyere mkpụrụ ọka a gwara mmanụ. Nʼihi na taa ka Onyenwe anyị ga-eme ka unu hụ ya anya.’ ” 5Ha wetara ihe ndị a niile bịa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute dịka Mosis nyere nʼiwu. Ọgbakọ ụmụ Izrel niile bịara nso guzo nʼihu Onyenwe anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.