Native Bible

Leviticus 9:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ chụkwara aja nsure ọkụ nʼusoro dịka iwu e nyere si dị.

Leviticus 9:16 in English

Leviticus 9:16 · Berean Standard Bible

He presented the burnt offering and offered it according to the ordinance.

Context

14Ọ sachara ihe dị nʼime afọ ya, na ụkwụ ya, kpọọ ha ọkụ, dịka aja nsure ọkụ. 15Emesịa, Erọn wetara onyinye nke dị maka ndị mmadụ, o were ewu ahụ bụ maka mmehie ndị mmadụ, gbuo ya, were chụọ aja mmehie, dịka o mere nke mbụ. 16Ọ chụkwara aja nsure ọkụ nʼusoro dịka iwu e nyere si dị. 17O webatakwara aja mkpụrụ ọka ahụ, kporo nke juru ya aka, kpọọ ya ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja, tinyekwara aja nsure ọkụ nke ụtụtụ ahụ. 18Nʼikpeazụ, o gburu ehi na ebule ahụ, nke bụ aja udo ndị Izrel. Ụmụ Erọn buteere ya ọbara nke o fesara gburugburu ebe ịchụ aja.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.