Levitikọs 8:13
Leviticus 8:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ kpọtara ụmụ ndị ikom Erọn nso, o yikwasịrị ha uwe ime ahụ, kee ha ihe okike nke ukwu, kekwasị ha ihe okike nʼisi, dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
Leviticus 8:13 in English
Leviticus 8:13 · Berean Standard Bible
Then Moses presented Aaron’s sons, put tunics on them, wrapped sashes around them, and tied headbands on them, just as the LORD had commanded him.
Context
11Ọ fesakwara ụfọdụ nʼime mmanụ ahụ ugboro asaa nʼebe ịchụ aja, fesakwa ya ugboro asaa nʼelu ngwongwo niile dị nʼebe ịchụ aja, na nʼefere e ji asa ihe, na ụkwụ ya, ido ha nsọ. 12Ọ wụsara Erọn ụfọdụ mmanụ nsọ ahụ nʼisi, tee ya mmanụ, nʼihi ido ya nsọ. 13Ọ kpọtara ụmụ ndị ikom Erọn nso, o yikwasịrị ha uwe ime ahụ, kee ha ihe okike nke ukwu, kekwasị ha ihe okike nʼisi, dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị. 14Ọ kpụtara oke ehi e ji achụ aja mmehie, mee ka Erọn na ụmụ ya ndị ikom bikwasị aka ha nʼelu isi ya. 15Mosis gburu oke ehi ahụ, were ụfọdụ nʼime ọbara ahụ, jiri mkpịsịaka ya rụta ọbara tee na mpi niile dị nʼebe ịchụ aja, ido ebe ịchụ aja ahụ nsọ. Ọ wụpụrụ ọbara nke fọdụrụ nʼụkwụ ala ala nke ebe ịchụ aja ahụ. Otu a ka o si doo ya nsọ, ikpuchiri ya mmehie.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.