Levitikọs 7:18
Leviticus 7:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na e rie anụ aja udo ahụ nʼụbọchị nke atọ, a gaghị anabata ya. A gaghị agụnyere ya onye ahụ wetara ya nʼihi na ihe rụrụ arụ ka ọ bụ. Onye ọbụla riri ya ga-abụ onye ikpe mara.
Leviticus 7:18 in English
Leviticus 7:18 · Berean Standard Bible
If any of the meat from his peace offering is eaten on the third day, it will not be accepted. It will not be credited to the one who presented it; it shall be an abomination, and the one who eats of it shall bear his iniquity.
Context
16“ ‘Ma ọ bụrụ na onyinye mmadụ wetara bụ onyinye afọ ofufu, maọbụ onyinye o wetara nʼihi nkwa o kwere, a ga-eri anụ aja ahụ nʼụbọchị ahụ a chụrụ ya, nweekwa ike rie nke fọdụrụ ma chi bọọ. 17Ma anụ ọbụla fọdụrụ nʼime anụ aja ahụ, nke a na-erichapụghị nʼụbọchị nke abụọ ahụ ka a ga-akpọ ọkụ. 18Ọ bụrụ na e rie anụ aja udo ahụ nʼụbọchị nke atọ, a gaghị anabata ya. A gaghị agụnyere ya onye ahụ wetara ya nʼihi na ihe rụrụ arụ ka ọ bụ. Onye ọbụla riri ya ga-abụ onye ikpe mara. 19“ ‘Anụ ọbụla nke metụrụ ihe rụrụ arụ aghọọla ihe na-adịghị ọcha. A gaghị eri ya. A ga-akpọ ya ọkụ. Ma nʼebe anụ ndị ọzọ dị, onye ọbụla e mere ka ọ dị ọcha nwere ike iri ya. 20A ga-esite nʼetiti ndị m kewapụ onye ọbụla riri anụ e ji chụọ aja udo nye Onyenwe anyị mgbe onye ahụ nọ nʼọnọdụ adịghị ọcha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.