Levitikọs 7:17
Leviticus 7:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma anụ ọbụla fọdụrụ nʼime anụ aja ahụ, nke a na-erichapụghị nʼụbọchị nke abụọ ahụ ka a ga-akpọ ọkụ.
Leviticus 7:17 in English
Leviticus 7:17 · Berean Standard Bible
But any meat of the sacrifice remaining until the third day must be burned up.
Context
15Ma anụ ahụ eji chụọ aja onyinye udo nke ekele, ka a ga-eri nʼotu ụbọchị ahụ e ji ha chụọ aja. O nweghị nke a ga-ahapụ ka ọ bọọ chi. 16“ ‘Ma ọ bụrụ na onyinye mmadụ wetara bụ onyinye afọ ofufu, maọbụ onyinye o wetara nʼihi nkwa o kwere, a ga-eri anụ aja ahụ nʼụbọchị ahụ a chụrụ ya, nweekwa ike rie nke fọdụrụ ma chi bọọ. 17Ma anụ ọbụla fọdụrụ nʼime anụ aja ahụ, nke a na-erichapụghị nʼụbọchị nke abụọ ahụ ka a ga-akpọ ọkụ. 18Ọ bụrụ na e rie anụ aja udo ahụ nʼụbọchị nke atọ, a gaghị anabata ya. A gaghị agụnyere ya onye ahụ wetara ya nʼihi na ihe rụrụ arụ ka ọ bụ. Onye ọbụla riri ya ga-abụ onye ikpe mara. 19“ ‘Anụ ọbụla nke metụrụ ihe rụrụ arụ aghọọla ihe na-adịghị ọcha. A gaghị eri ya. A ga-akpọ ya ọkụ. Ma nʼebe anụ ndị ọzọ dị, onye ọbụla e mere ka ọ dị ọcha nwere ike iri ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.