Native Bible

Leviticus 6:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“ ‘Ndị a bụ usoro iwu gbasara onyinye mkpụrụ ọka. Ụmụ Erọn ndị ikom ga-eguzo nʼihu ebe ịchụ aja iche ya nʼihu Onyenwe anyị.

Leviticus 6:14 in English

Leviticus 6:14 · Berean Standard Bible

Now this is the law of the grain offering: Aaron’s sons shall present it before the LORD in front of the altar.

Context

12Ọkụ dị nʼebe ịchụ aja ga na-enwu mgbe niile, a gaghị ekwe ka ọ nyụọ. Nʼụtụtụ niile onye nchụaja ga-akwanye ya nkụ ọhụrụ, tụkwasịkwa aja nsure ọkụ nʼelu ya surekwaa abụba aja udo nʼelu ya. 13Ọkụ ga-enwugide nʼebe ịchụ aja mgbe niile. A gaghị ekwe ka ọ nyụọ mgbe ọbụla.’ 14“ ‘Ndị a bụ usoro iwu gbasara onyinye mkpụrụ ọka. Ụmụ Erọn ndị ikom ga-eguzo nʼihu ebe ịchụ aja iche ya nʼihu Onyenwe anyị. 15Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-ekpoju ọka ahụ a kwọrọ nke ọma, na ụfọdụ mmanụ oliv, tinyere ụda na-esi isi ụtọ nʼaka ya dịka oke ncheta. Kpọọ ya ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja ka ọ nọchie anya onyinye ahụ niile, nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi mma. 16*Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eri nke fọdụrụnụ. Ma a ga-eri ya na-ejighị ihe na-eko achịcha, nʼime ebe nsọ, nʼogige ụlọ nzute ka a ga-anọ eri ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.