Levitikọs 26:11
Leviticus 26:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m eme ka ebe obibi m dịrị nʼetiti unu. Agaghị m asọ unu oyi.
Leviticus 26:11 in English
Leviticus 26:11 · Berean Standard Bible
And I will make My dwelling place * among you, and My soul will not despise * you.
Context
9“ ‘Aga m eji ihuọma leta unu, mee ka unu mụbaa ma jupụta nʼọnụọgụgụ. Aga m eme ka ọgbụgba ndụ m nʼebe unu nọ dịgide. 10Unu ga-enwebiga mkpụrụ ubi oke ruo na mgbe unu ka nọ na-eri ndị ochie unu ga-ewezuga ha nʼakụkụ maka inye ohere iwebata ihe ubi ọhụrụ. 11Aga m eme ka ebe obibi m dịrị nʼetiti unu. Agaghị m asọ unu oyi. 12Aga m ejegharị nʼetiti unu, bụrụ Chineke unu, unu ga-abụkwa ndị m. 13Nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt, ka unu ghara ịbụ ndị ohu ọzọ. Etijiela m mkpọrọ igwe* nke ịbụ ohu unu, mee ka unu bụrụ ndị ji nganga ejegharị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.