Levitikọs 25:54
Leviticus 25:54 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Ma ọ bụrụ na e nweghị ike gbapụta ya site nʼụzọ ndị a niile, ya na ụmụ ya ga-enwere onwe ha mgbe afọ inwere onwe ahụ zuru.
Leviticus 25:54 in English
Leviticus 25:54 · Berean Standard Bible
Even if he is not redeemed in any of these ways, he and his children shall be released in the Year of Jubilee.
Context
52Ọ bụrụ naanị afọ ole na ole fọdụrụ tupu afọ inwere onwe eruo, ọ ga-agụkọ ihe ego ahụ pụtara, kwụọ ya maka ịgbara onwe ya dịka o kwesiri. 53A ga-emeso ha dịka ndị ọrụ e goro ego kwa afọ, ma ị ga-ahụ na onye ha nọ nʼokpuru ya agaghị eji aka ike chịa ha. 54“ ‘Ma ọ bụrụ na e nweghị ike gbapụta ya site nʼụzọ ndị a niile, ya na ụmụ ya ga-enwere onwe ha mgbe afọ inwere onwe ahụ zuru. 55Nʼihi na mụ ka ụmụ Izrel bụ ndị ohu nye. Ha bụ ndị ohu m, ndị m kpọpụtara site nʼala Ijipt. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
25:10 Inwere onwe pụtara mmeri maọbụ Jubili.
25:36 Ọpụ 22:25
25:43 Ọpụ 1:13
25:49 Nwanna Onye ahụ ga-abụ nwa nwoke nwanne nna ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.