Native Bible

Leviticus 25:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼala obibi unu niile, unu ga-enye ohere maka mgbapụta ala erere ere.

Leviticus 25:24 in English

Leviticus 25:24 · Berean Standard Bible

Thus for every piece of property you possess, you must provide for the redemption of the land.

Context

22Mgbe unu ga-akụ ihe ubi nʼafọ nke asatọ unu ga na-eri site nʼowuwe ihe ubi ochie unu tutu ruo nʼafọ nke itoolu mgbe unu ga-ewebata ihe ubi ọhụrụ. 23“ ‘Chetanụ na ala bụ nke m, nʼihi nke a, o kwesighị ka unu ree ala ọbụla kpamkpam. Unu bụ naanị ndị ọbịa na ndị nlekọta nye m. 24Nʼala obibi unu niile, unu ga-enye ohere maka mgbapụta ala erere ere. 25“ ‘Ọ bụrụ na otu onye nʼime unu aghọọ onye ogbenye si otu a ree ala ya, nwanna ya dị ya nso ga-abịa gbapụta ala ahụ. 26Ọ bụrụ na-enweghị onye ga-agbapụta ala ahụ nye ha, ma ha mesịa ghọọ ndị bara ụba nwekwa ihe ga-ezu ịgbapụta ala ahụ nʼonwe ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.