Levitikọs 24:2
Leviticus 24:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nye ndị Izrel niile iwu ka ha wetara gị mmanụ oliv asụrụ asụ, nke a na-agwaghị ihe, maka itinye nʼiheọkụ ime ka ọkụ oriọna na-enwu mgbe niile.
Leviticus 24:2 in English
Leviticus 24:2 · Berean Standard Bible
“Command the Israelites to bring you pure oil of pressed olives for the light, to keep the lamps burning continually.
Context
1Onyenwe anyị gwara Mosis sị, 2“Nye ndị Izrel niile iwu ka ha wetara gị mmanụ oliv asụrụ asụ, nke a na-agwaghị ihe, maka itinye nʼiheọkụ ime ka ọkụ oriọna na-enwu mgbe niile. 3Na mpụta nke akwa mgbochi nke kpuchiri igbe Ihe Ama ahụ, nʼime ụlọ nzute, Erọn ga-amụnye oriọna ndị ahụ nʼihu Onyenwe anyị mgbe niile, site nʼuhuruchi ruo nʼụtụtụ. Nke a bụ ụkpụrụ ga-adịgide nye ọgbọ niile dị nʼihu. 4Ihe ọkụ ọlaedo a nụchara anụcha ndị ahụ dọọ nʼelu ihe ịdọkwasị oriọna, nʼihu Onyenwe anyị ga na-enwu ọkụ mgbe niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.