Levitikọs 24:10
Leviticus 24:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu nwokorobịa, nke nna ya bụ onye Ijipt ma nne ya bụ onye Izrel, sitere nʼetiti ụmụ Izrel pụta. O ruo na nwoke a nne ya bụ onye Izrel na otu nʼime ndị ikom Izrel malitere ịlụ ọgụ.
Leviticus 24:10 in English
Leviticus 24:10 · Berean Standard Bible
Now the son of an Israelite mother and an Egyptian father went out among the Israelites, and a fight broke out in the camp between him and an Israelite.
Context
8A ga-edo achịcha ndị a nʼihu Onyenwe anyị oge niile, ụbọchị izuike niile, nʼọnọdụ ụmụ Izrel, dịka ọgbụgba ndụ ebighị ebi. 9Ọ dịrị Erọn na ụmụ ya ndị ikom, bụ ndị ga-eri ya nʼime nʼebe nsọ ahụ, nʼihi na ọ bụ oke dịkarịsịrị nsọ, site nʼoke ha mgbe niile, nke sitere nʼonyinye nsure ọkụ e chere nye Onyenwe anyị.” 10Otu nwokorobịa, nke nna ya bụ onye Ijipt ma nne ya bụ onye Izrel, sitere nʼetiti ụmụ Izrel pụta. O ruo na nwoke a nne ya bụ onye Izrel na otu nʼime ndị ikom Izrel malitere ịlụ ọgụ. 11Mgbe ha na-alụ ọgụ ahụ nwoke ahụ nne ya bụ onye Izrel kwuluru Aha ahụ kọchaa ya. Nʼihi ya, a kpọrọ ya ikpe nʼihu Mosis. (Aha nne ya bụ Shelomit, nwa Dibri, onye ebo Dan.) 12Ha tinyere nwoke ahụ nʼụlọ mkpọrọ na-eche ka ha nụ okwu Onyenwe anyị, ịmata ihe ha ga-eme ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.