Native Bible

Leviticus 23:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aja mkpụrụ ọka ga-eso aja nsure ọkụ a. Ọ ga-eji iko ọka a kwọrọ nke ọma iri na abụọ a gwara mmanụ oliv, ka ọ bụrụ ihe e surere nʼọkụ na-esi ezi isi ọma nye Onyenwe anyị. A ga-enyekwa iko mmanya atọ dịka onyinye ihe ọṅụṅụ

Leviticus 23:13 in English

Leviticus 23:13 · Berean Standard Bible

along with its grain offering of two-tenths of an ephah of fine flour * mixed with oil—an offering made by fire to the LORD, a pleasing aroma—and its drink offering of a quarter hin of wine.*

Context

11Ọ ga-anara unu ukwu ọka ahụ fufee ya nʼihu Onyenwe anyị, ka a nabata ya. Ọ bụ nʼụbọchị ahụ ga-esote ụbọchị izuike ka onye nchụaja ga-efufe ya. 12Nʼotu ụbọchị ahụ e fufere ukwu ọka ahụ, unu ga-ewere nwa ebule na-enweghị ntụpọ, nke gbara naanị otu afọ, chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ. 13Aja mkpụrụ ọka ga-eso aja nsure ọkụ a. Ọ ga-eji iko ọka a kwọrọ nke ọma iri na abụọ a gwara mmanụ oliv, ka ọ bụrụ ihe e surere nʼọkụ na-esi ezi isi ọma nye Onyenwe anyị. A ga-enyekwa iko mmanya atọ dịka onyinye ihe ọṅụṅụ 14Unu agaghị eri achịcha, maọbụ ọka e ghere eghe, maọbụ ọka ọhụrụ tutu ruo mgbe unu buru ụzọ weta onyinye nye Chineke unu. Nʼebe ọbụla unu bi, ụkpụrụ a ga-adịgide ruo ọgbọ niile. 15“ ‘Site nʼụbọchị ahụ sotere ụbọchị izuike, bụ ụbọchị ahụ unu wetara ukwu ọka nke onyinye mfufe, gụpụta izu asaa zuru ezu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.