Levitikọs 19:26
Leviticus 19:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Unu erila anụ ọbụla ọbara dị nʼime ya. “ ‘Unu agbala afa maọbụ jụta mmụọ ase.
Leviticus 19:26 in English
Leviticus 19:26 · Berean Standard Bible
You must not eat anything with blood still in it. You must not practice divination or sorcery.
Context
24Nʼafọ nke anọ, mkpụrụ nke osisi ndị ahụ niile ga-amị dị nsọ. Unu ga-eji ya nye Onyenwe anyị onyinye otuto. 25Site nʼafọ nke ise, mkpụrụ ọbụla ga-abụ nke unu. Nʼụzọ dị otu a ihe ha ga-amịpụta ga-adị ukwuu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu. 26“ ‘Unu erila anụ ọbụla ọbara dị nʼime ya.
“ ‘Unu agbala afa maọbụ jụta mmụọ ase. 27“ ‘Unu akpụchala agịrị isi dị gburugburu akụkụ isi unu, maọbụ chabie ọnụ ọnụ afụọnụ unu. 28“ ‘Unu akala ihe ọbụla nʼahụ unu, nʼihi onye nwụrụ anwụ maọbụ jiri mma ọkụ dee ihe nʼahụ unu. Abụ m Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.